Deuteronomy 14:3-21

3Erila ihe ọbụla m kwuru na ọ bụ ihe rụrụ arụ. 4Ndị a bụ anụmanụ unu ga-eri: ehi, atụrụ, na ewu, 5na ele nta, na mgbada, na atụrụ ọhịa, na ewu ọhịa, ele ukwu, na anịgọ bi nʼelu ugwu. 6Anụmanụ ọbụla ụkwụ ya wara njakpa, nke na-atagharị ọnụ ka unu ga-eri. 7Ma otu ọ dị, nʼetiti anụ ndị ahụ na-atagharị nri maọbụ ndị ụkwụ ha wara njakpa, ndị a ka unu na-agaghị eri, ịnyịnya kamel, na ewi maọbụ ewi nkume, na anụ ndị ọzọ yiri ha, ọ bụ ezie na ha na-atagharị ọnụ, ma ha enweghị ụkwụ wara njakpa. Ha bụ ihe na-adịghị ọcha nye unu. 8Ezi bụkwa anụ na-adịghị ọcha; ọ bụ ezie na o nwere ụkwụ wara njakpa, ma ọ dịghị atagharị nri. Unu agaghị emetụla ozu ha aka maọbụ rie anụ ha.

9Nʼime ihe niile e kere eke, dị ndụ, biri na mmiri, unu nwere ike iri nke ọbụla nwere ntu na akpịrịkpa, 10ma ihe ọbụla nke na-enweghị ntu na akpịrịkpa, unu erila ha, nʼihi na ha rụrụ arụ.

11Unu ga-eri nnụnụ ọbụla dị ọcha, 12ma unu agaghị eri ndị a: ugo, na udele, na udele ojii, 13na ndagbụ, na ọgankwọ, na ndagbụ dị iche iche, 14na ugolọma ọbụla dị iche iche, 15na enyi nnụnụ, na egbe abalị, na nnụnụ oke osimiri, na egbe dị iche iche, 16na okwukwu nta, na okwukwu ukwu, na okwukwu nwere mpi, 17na okwolo na udele, na komorant, 18na ụgbala, na utù dị iche iche, na nnụnụ ọdụ nta, na ụsụ.

19Ụmụ ahụhụ niile na-efe efe rụrụ arụ nye unu, unu erila ha, 20Ma unu nwere ike iri ụmụ ahụhụ ndị ahụ nwere nku, ndị dị ọcha.

21Unu erila anụ ọbụla nwụrụ anwụ. Ma otu o si dị, onye ọbịa nʼetiti unu nwere ike rie ya. I nwere ike inye ya, maọbụ resi ya onye ahụ, ma erila ya, nʼihi na onye dị nsọ nye Onyenwe anyị Chineke gị ka ị bụ.

Esila nwa ewu maọbụ nwa atụrụ nʼime mmiri ara nne ya.

Copyright information for IboBIU